Ilu 4

Nwa m, ṅaa m ntị, meekwa ihe m gwara gị; ị ga-enwekwa ndụ ogologo.

Proverbs 4:10 (UKJV) Hear, O my son, and receive my sayings; and the years of your life shall be many.

8Ọ bụrụ na i bulie amamihe elu, o ga-ebulikwa gị elu. Jidesie ya ike, ọ ga-ewetara gị oke nsọpụrụ.

9Ọ ga-eji okpueze okoko osisi chọọ isi gị mma nyekwa gị okpueze mara mma nʼisi gị.”

10Nwa m, ṅaa m ntị, meekwa ihe m gwara gị; ị ga-enwekwa ndụ ogologo.

11M ga-edu gị nʼụzọ nke amamihe, duokwa gị nʼụzọ ziri ezi.

12Ọ bụrụ na i bie ụdị ndụ dị otu a, ihe agaghị akpọ gị nʼụkwụ nʼije gị, ị gaghị asụkwa ngọngọ mgbe ị na-agba ọsọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.