Ilu 4

M ga-edu gị nʼụzọ nke amamihe, duokwa gị nʼụzọ ziri ezi.

Proverbs 4:11 (UKJV) I have taught you in the way of wisdom; I have led you in right paths.

9Ọ ga-eji okpueze okoko osisi chọọ isi gị mma nyekwa gị okpueze mara mma nʼisi gị.”

10Nwa m, ṅaa m ntị, meekwa ihe m gwara gị; ị ga-enwekwa ndụ ogologo.

11M ga-edu gị nʼụzọ nke amamihe, duokwa gị nʼụzọ ziri ezi.

12Ọ bụrụ na i bie ụdị ndụ dị otu a, ihe agaghị akpọ gị nʼụkwụ nʼije gị, ị gaghị asụkwa ngọngọ mgbe ị na-agba ọsọ.

13Mee ihe niile m gwara gị, echefukwala ha, nʼihi na ọ ga-eduba gị na ndụ zuruoke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.