11M ga-edu gị nʼụzọ nke amamihe, duokwa gị nʼụzọ ziri ezi.
12Ọ bụrụ na i bie ụdị ndụ dị otu a, ihe agaghị akpọ gị nʼụkwụ nʼije gị, ị gaghị asụkwa ngọngọ mgbe ị na-agba ọsọ.
13Mee ihe niile m gwara gị, echefukwala ha, nʼihi na ọ ga-eduba gị na ndụ zuruoke.
14Emela dịka ndị na-emebi iwu. Esokwala ụzọ ha.
15Zeere ha, ejekwala nʼụzọ ha; chepu ihu gị nʼụzọ ahụ,