13Mee ihe niile m gwara gị, echefukwala ha, nʼihi na ọ ga-eduba gị na ndụ zuruoke.
14Emela dịka ndị na-emebi iwu. Esokwala ụzọ ha.
15Zeere ha, ejekwala nʼụzọ ha; chepu ihu gị nʼụzọ ahụ,
16nʼihi na ndị na-emebi iwu adịghị arahụ ụra tutu ha emee arụ nke ụbọchị ahụ. Ha anaghị ezu ike tutu ha emee ka otu onye maa nʼọnya.
17Ha na-eri ihe oriri nke mmebi iwu, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ nke ọgbaaghara.