26Nʼihi na nwanyị akwụna ka enwere ike iji otu ogbe achịcha nweta, ma nwunye nwoke ọzọ na-achụ nta ndụ gị ịla ya nʼiyi.
27Mmadụ ọ pụrụ ịgụrụ ọkụ tụkwasị nʼahụ ya, ma uwe ya ereghị ọkụ?
28Mmadụ ọ pụrụ ije ije nʼelu icheku ọkụ ma ụkwụ ya ahapụ igbuchapụ?
29Otu a ka ọ na-adịrị nwoke na-abakwuru nwunye mmadụ ibe ya; o nweghị onye ọbụla na-emetụ ya aka nke a na-agaghị ata ahụhụ.
30Ndị mmadụ adịghị eleda onye ohi anya ma ọ bụrụ na o zuo ohi ka o were gboo mkpa agụụ nke na-agụsị ya ike.