28Mmadụ ọ pụrụ ije ije nʼelu icheku ọkụ ma ụkwụ ya ahapụ igbuchapụ?
29Otu a ka ọ na-adịrị nwoke na-abakwuru nwunye mmadụ ibe ya; o nweghị onye ọbụla na-emetụ ya aka nke a na-agaghị ata ahụhụ.
30Ndị mmadụ adịghị eleda onye ohi anya ma ọ bụrụ na o zuo ohi ka o were gboo mkpa agụụ nke na-agụsị ya ike.
31Ma ọ bụrụ na ejide ya ọ ga-akwụghachi ụgwọ ihe niile ahụ o zuru okpukpu asaa. Nʼagbanyeghị na nke a ga-eme ka o ree ihe niile o ji biri nʼụlọ ya.
32Ma nwoke ahụ na-akwa iko bụ onye nzuzu, amamihe kọrọ ya, nʼihi na ọ bụ onwe ya ka ọ na-ala nʼiyi.