14“Emezuru m nkwa niile m kwere taa, enwekwara m nri nke sitere nʼihe aja udo m chụrụ nʼụlọ m,
15Ọ bụ gị ka m na-achọkwute, lee gị ka ị na-abịa.
16Agbasaala m akwa mara mma nʼelu ihe ndina m, bụ akwa ọcha mara mma tụrụ ọtụtụ agwa nke e ji ogho ndị Ijipt kpaa.
17Efesakwala m mmanụ isi ọma nke máá, aloos na sinamọn nʼelu nʼihe ndina m.
18Bịa, ka anyị were ịhụnanya ṅụjụbiga afọ anyị; ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ site ugbu a ruo ụtụtụ echi.