19Nʼihi na di m anọghị nʼụlọ o jeela njem dị anya.
20O ji akpa ego juru gaa njem, abalị ole na ole ga-agafekwa tupu ọ lọta.”
21Otu a ka o si jiri okwu ire ụtọ ya megharịa nwokorobịa ahụ isi tutu o kwenyere ya. O nwekwaghị ike ịnapụta onwe ya site nʼokwu nrafu nke nwanyị ahụ.
22O sooro nwanyị ahụ dịka ehi a na-adọkpụ na-aga ebe a ga-egbu ya, dịka ele nke na-aba nʼọnya,
23nke na-eche ka e were àkụ gbata ya nʼobi. Nwoke ahụ dịka nnụnụ nke na-efeba nʼọnya na-amaghị ihe na-eche ya pụrụ iwepụ ndu ya.