25tupu e kee ugwu ukwu na ugwu nta.
26E, amụọla m rịị tupu Chineke ekee ụwa na osisi niile, na aja niile dị nʼime ya.
27Anọ m ya mgbe o doziri mbara eluigwe nʼọnọdụ ya, mgbe ọ tụsara ha nʼelu ogbu mmiri niile;
28mgbe o hiwere mbara eluigwe, mgbe o mere ka isi iyi niile nke ogbu mmiri dị ike,
29mgbe ọ kpara oke nye osimiri ebe ọ ga-akwụsị, ka mmiri ya ghara ịgafe iwu ya, mgbe ọ kara akara ebe a tọrọ ntọala nke ụwa.