27Anọ m ya mgbe o doziri mbara eluigwe nʼọnọdụ ya, mgbe ọ tụsara ha nʼelu ogbu mmiri niile;
28mgbe o hiwere mbara eluigwe, mgbe o mere ka isi iyi niile nke ogbu mmiri dị ike,
29mgbe ọ kpara oke nye osimiri ebe ọ ga-akwụsị, ka mmiri ya ghara ịgafe iwu ya, mgbe ọ kara akara ebe a tọrọ ntọala nke ụwa.
30Oge ahụ niile ka m na-anọ nʼakụkụ ya dịka onye ǹka. Ihe banyere m na-atọkwa ya ụtọ; ana m egwuri egwu nʼihu ya.
31Ihe niile o kere tọkwara m ụtọ, ụwa niile na ụmụ mmadụ!