Ilu 8

“Nʼihi ya, ụmụ m ndị ikom, geenụ m ntị; nʼihi na ndị niile na-eso ụzọ m na-enwe ọṅụ.

Proverbs 8:32 (UKJV) Now therefore hearken unto me, O all of you children: for blessed are they that keep my ways.

30Oge ahụ niile ka m na-anọ nʼakụkụ ya dịka onye ǹka. Ihe banyere m na-atọkwa ya ụtọ; ana m egwuri egwu nʼihu ya.

31Ihe niile o kere tọkwara m ụtọ, ụwa niile na ụmụ mmadụ!

32“Nʼihi ya, ụmụ m ndị ikom, geenụ m ntị; nʼihi na ndị niile na-eso ụzọ m na-enwe ọṅụ.

33Gee ntị na ndụmọdụ m ka ị bụrụ onye maara ihe, agbakụtakwala ndụmọdụ m azụ.

34Ngọzị dịrị mmadụ ahụ na-aṅa ntị nʼokwu m, onye na-anọ na nche nʼọnụ ụzọ m ụbọchị niile, onye na-anọ na-echere m nʼọnụ ụzọ ụlọ m;

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.