Ilu 8

Ngọzị dịrị mmadụ ahụ na-aṅa ntị nʼokwu m, onye na-anọ na nche nʼọnụ ụzọ m ụbọchị niile, onye na-anọ na-echere m nʼọnụ ụzọ ụlọ m;

Proverbs 8:34 (UKJV) Blessed is the man that hears me, watching daily at my gates, waiting at the posts of my doors.

32“Nʼihi ya, ụmụ m ndị ikom, geenụ m ntị; nʼihi na ndị niile na-eso ụzọ m na-enwe ọṅụ.

33Gee ntị na ndụmọdụ m ka ị bụrụ onye maara ihe, agbakụtakwala ndụmọdụ m azụ.

34Ngọzị dịrị mmadụ ahụ na-aṅa ntị nʼokwu m, onye na-anọ na nche nʼọnụ ụzọ m ụbọchị niile, onye na-anọ na-echere m nʼọnụ ụzọ ụlọ m;

35nʼihi na onye ọbụla chọtara m chọtara ndụ; ọ natakwala ihuọma nʼebe Onyenwe anyị nọ.

36Ma onye na-enweghị ike chọta m na-emerụ onwe ya ahụ; ndị niile kpọrọ m asị hụrụ ọnwụ nʼanya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.