Abụ Ọma 10

Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Chineke echefuola. O zofuola ihu ya, ọ dịghị mgbe ọ hụrụ ya.”

Psalm 10:11 (UKJV) He has said in his heart, God has forgotten: he hides his face; he will never see it.

9Dịka ọdụm, ha anaghị eme mkpọtụ ọbụla, ọ na-eche ịdakwasị ụmụ ogbenye. Dịka ndị bụ dinta si ejide ụmụ anụmanụ nʼọnya ha siri, otu a ka ha si ejide ụmụ ogbenye.

10Ụmụ ogbenye ndị a na-ada nʼala nʼihi ịdị ike ya, ọ na-azọpịakwa ha.

11Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Chineke echefuola. O zofuola ihu ya, ọ dịghị mgbe ọ hụrụ ya.”

12Bilie O Onyenwe anyị! O Chineke welie aka gị, echefukwala ndị na-enweghị onye inyeaka.

13Gịnị mere onye ajọ omume ji na-eleda Chineke anya? Gịnị mere o ji na-asị nʼime obi ya, “Ọ gaghị akpọ m ka m zaa ajụjụ banyere omume m”?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.