7Ọnụ ya jupụtara nʼokwu ụgha na ịba mba ime ihe ọjọọ, nʼokpuru ire ya ka nsogbu na ajọ ihe dịkwa.
8Ha na-ezo onwe ha nʼobodo nta dị iche iche, nʼebe zooro ezo ka ha na-anọ, na-eche itigbu ndị aka ha dị ọcha.
9Dịka ọdụm, ha anaghị eme mkpọtụ ọbụla, ọ na-eche ịdakwasị ụmụ ogbenye. Dịka ndị bụ dinta si ejide ụmụ anụmanụ nʼọnya ha siri, otu a ka ha si ejide ụmụ ogbenye.
10Ụmụ ogbenye ndị a na-ada nʼala nʼihi ịdị ike ya, ọ na-azọpịakwa ha.
11Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Chineke echefuola. O zofuola ihu ya, ọ dịghị mgbe ọ hụrụ ya.”