23Mgbe ahụ, Izrel bara nʼala Ijipt; Jekọb bikwara nʼala Ham dịka onye si mba ọzọ bịa.
24Onyenwe anyị mere ka ndị ya mụbaa nke ukwuu; o mere ka ndị ya dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa ndị iro ha,
25ndị ọ tụgharịrị obi ha ka ha kpọọ ndị ya asị, ka ha gbaa izu nzuzo megide ndị ohu ya.
26O zipụrụ Mosis, ohu ya, na Erọn, onye ọ họpụtara.
27Ha mere ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche nʼetiti ha, ọrụ ebube ya dị iche iche nʼala Ham.