1Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma; ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
2Ka ndị niile Onyenwe anyị gbapụtara kwuo otu a, ndị niile ọ gbapụtara site nʼaka onye kpọrọ ha asị,
3ndị ọ kpọlatara site nʼala niile dị iche iche, site nʼọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ, site nʼugwu na ndịda.