1Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma; ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
2Ka ndị niile Onyenwe anyị gbapụtara kwuo otu a, ndị niile ọ gbapụtara site nʼaka onye kpọrọ ha asị,
3ndị ọ kpọlatara site nʼala niile dị iche iche, site nʼọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ, site nʼugwu na ndịda.
4Ụfọdụ wagharịrị nʼọzara, ala nke tọgbọrọ nʼefu, ha enweghị ike ịchọta ụzọ nke ga-eduba ha nʼobodo ebe ha ga-ebi.