29O mere ka oke ifufe dere duu; o mekwara ka ebili mmiri nke oke osimiri dajụọ.
30Ha ṅụrịrị ọṅụ mgbe ọ dajụrụ, o duuru ha ruo ebe ha na-aga nʼudo.
31Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ.
32Ka ha bulie ya elu nʼetiti ọgbakọ ukwu ụmụ mmadụ ma tookwa ya na nzukọ ndị okenye.
33Ọ na-eme ka iyi ghọọ ọzara; na-emekwa ka ebe mmiri si asọpụta ghọọ ala kpọrọ nkụ.