27Ha na-adagharị, na-aṅagharịkwa dịka ndị ṅụbigara mmanya oke. Mmụta ha banyere ịnya ụgbọ mmiri adịghị enyekwara ha aka nʼoge dị otu a.
28Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha, o mere ka ha pụta na mkpagbu ahụ niile.
29O mere ka oke ifufe dere duu; o mekwara ka ebili mmiri nke oke osimiri dajụọ.
30Ha ṅụrịrị ọṅụ mgbe ọ dajụrụ, o duuru ha ruo ebe ha na-aga nʼudo.
31Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ.