37Ha ghara mkpụrụ nʼubi ha dị iche iche, kụọkwa ọtụtụ ubi vaịnị ndị mịrị mkpụrụ dị ukwuu;
38ọ gọziri ha, ọnụọgụgụ ha bakwara ụba, o mekwara ka anụ ụlọ ha mụbaa.
39Mgbe ahụ, ọnụọgụgụ ha adịghịkwa ka ọ dị na mbụ, ha bụ ndị e ji mkpagbu na ihe ndakwasị na iru ụjụ wedata nʼala;
40onye ahụ na-eleda ndị na-achị achị anya mere ka ha wagharịa nʼọzara, ebe ụzọ na-adịghị.
41Ma ọ na-anapụta ndị mkpa na-akpa site na nhụju anya ha, mee ka ezinaụlọ ha mụbaa dịka igwe anụ ụlọ.