39Mgbe ahụ, ọnụọgụgụ ha adịghịkwa ka ọ dị na mbụ, ha bụ ndị e ji mkpagbu na ihe ndakwasị na iru ụjụ wedata nʼala;
40onye ahụ na-eleda ndị na-achị achị anya mere ka ha wagharịa nʼọzara, ebe ụzọ na-adịghị.
41Ma ọ na-anapụta ndị mkpa na-akpa site na nhụju anya ha, mee ka ezinaụlọ ha mụbaa dịka igwe anụ ụlọ.
42Ndị ezi omume na-ahụ ya na-aṅụrị ọṅụ, ma ndị ajọ omume na-emechi ọnụ ha nọọ duu.
43Onye ọbụla maara ihe ga-echezi echiche banyere ihe ndị a, ma tuleekwa ọrụ ịhụnanya Onyenwe anyị nke dị ukwuu.