8Ndị na-eme ha ga-adịkwa ka ha. Ndị na-atụkwasị ha obi ga-adịkwa ka ha.
9Ụmụ Izrel, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi ọ bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
10Ezinaụlọ Erọn, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Ọ bụ ya bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
11Unu ndị na-atụ egwu ya, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi ọ bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
12Onyenwe anyị na-echeta anyị, ọ ga-agọzikwa anyị, ọ ga-agọzi ndị ya bụ Izrel, ọ ga-agọzi ezinaụlọ Erọn,