10Ezinaụlọ Erọn, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Ọ bụ ya bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
11Unu ndị na-atụ egwu ya, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi ọ bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
12Onyenwe anyị na-echeta anyị, ọ ga-agọzikwa anyị, ọ ga-agọzi ndị ya bụ Izrel, ọ ga-agọzi ezinaụlọ Erọn,
13ọ ga-agọzi ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ma onye nta ma onye ukwu.
14Ka Onyenwe anyị mee ka unu mụbaa, unu na ụmụ unu.