102Ewezugaghị m onwe m nʼiwu gị niile, nʼihi na ọ bụ gị onwe gị ziri m ha.
103Lee ka okwu gị niile si atọ m ụtọ, ha dị ụtọ nʼọnụ m karịa mmanụ aṅụ!
104A na-enweta nghọta site nʼụkpụrụ gị niile; ya mere ana m akpọ ụzọ ọjọọ ọbụla asị.
105Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m bụrụkwa ìhè nʼụzọ m.
106Aṅụọla m iyi, mee ka o guzosie ike, na aga m agbaso iwu ezi omume gị niile.