104A na-enweta nghọta site nʼụkpụrụ gị niile; ya mere ana m akpọ ụzọ ọjọọ ọbụla asị.
105Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m bụrụkwa ìhè nʼụzọ m.
106Aṅụọla m iyi, mee ka o guzosie ike, na aga m agbaso iwu ezi omume gị niile.
107Ataala m ahụhụ nke ukwuu; chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka okwu gị si dị.
108O Onyenwe anyị, nabata otuto afọ ofufu niile nke si nʼọnụ m, kuziekwara m iwu gị niile.