110Ndị ajọ omume esielera m ọnya, ma esitebeghị m nʼụkpụrụ gị kpafuo.
111Iwu gị niile bụ ihe nketa m ruo mgbe ebighị ebi; ha bụ ihe na-enye obi m ọṅụ.
112Obi m ekpebiela idebe ụkpụrụ gị ruo na ngwụcha.
113Ana m akpọ ndị na-enwe obi abụọ asị, ma ahụrụ m iwu gị nʼanya.
114Ị bụ ebe mgbaba m na ọta m; olileanya m dị nʼokwu gị.