112Obi m ekpebiela idebe ụkpụrụ gị ruo na ngwụcha.
113Ana m akpọ ndị na-enwe obi abụọ asị, ma ahụrụ m iwu gị nʼanya.
114Ị bụ ebe mgbaba m na ọta m; olileanya m dị nʼokwu gị.
115Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-eme ihe ọjọọ, ka m nwee ike idebe iwu niile nke Chineke m!
116Gbaa m ume dịka nkwa gị si dị, aga m adịkwa ndụ; ekwekwala ka olileanya m daa.