108O Onyenwe anyị, nabata otuto afọ ofufu niile nke si nʼọnụ m, kuziekwara m iwu gị niile.
109Mkpụrụobi m na-adị m nʼọbụaka m oge niile, ma echezọghị m iwu gị.
110Ndị ajọ omume esielera m ọnya, ma esitebeghị m nʼụkpụrụ gị kpafuo.
111Iwu gị niile bụ ihe nketa m ruo mgbe ebighị ebi; ha bụ ihe na-enye obi m ọṅụ.
112Obi m ekpebiela idebe ụkpụrụ gị ruo na ngwụcha.