Abụ Ọma 119

Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè; ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe.

Psalm 119:130 (UKJV) The entrance of your words gives light; it gives understanding unto the simple.

128nʼihi na m na-ahụta ụkpụrụ gị niile ka ihe ziri ezi, akpọrọ m ụzọ niile na-ezighị ezi asị.

129Iwu gị niile dị ịtụnanya; ya mere, ana m erubere ha isi.

130Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè; ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe.

131Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike, na-achọsi iwu gị niile ike.

132Chee m ihu, meere m ebere, dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.