129Iwu gị niile dị ịtụnanya; ya mere, ana m erubere ha isi.
130Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè; ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe.
131Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike, na-achọsi iwu gị niile ike.
132Chee m ihu, meere m ebere, dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere.
133Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị; ekwela ka mmehie chịa m.