131Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike, na-achọsi iwu gị niile ike.
132Chee m ihu, meere m ebere, dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere.
133Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị; ekwela ka mmehie chịa m.
134Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m, ka m nwee ike debe iwu gị.
135Mee ka ihuọma gị dịkwasị nʼahụ ohu gị. Kuziere m ụkpụrụ gị niile.