Abụ Ọma 119

Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m, ka m nwee ike debe iwu gị.

Psalm 119:134 (UKJV) Deliver me from the oppression of man: so will I keep your precepts.

132Chee m ihu, meere m ebere, dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere.

133Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị; ekwela ka mmehie chịa m.

134Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m, ka m nwee ike debe iwu gị.

135Mee ka ihuọma gị dịkwasị nʼahụ ohu gị. Kuziere m ụkpụrụ gị niile.

136Anya mmiri akwa na-agba m nke ukwuu nʼihi na ndị mmadụ adịghị erube isi nye iwu gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.