137O Onyenwe anyị, ị bụ onye ezi omume, iwu gị niile zikwara ezi.
138Ụkpụrụ gị niile ziri ezi; ha kwesiri ntụkwasị obi.
139Nʼihi na ndị iro m na-elefu okwu gị anya, ịnụ ọkụ nʼobi m na-ada mba.
140Nkwa gị niile bụ ihe enyochara nke ọma, ohu gị na-ahụkwa ha nʼanya.
141Ọ bụ ezie na m bụ onye dị ala, na onye a na-eleda anya, ma adịghị m eleda ụkpụrụ gị niile anya.