Abụ Ọma 119

Eji m obi m niile na-akpọ oku; zaa m o Onyenwe anyị, aga m erubekwa isi nye ụkpụrụ gị niile.

Psalm 119:145 (UKJV) I cried with my whole heart; hear me, O LORD: I will keep your statutes.

143Nsogbu na ihe mgbu adakwasịla m, ma iwu gị niile bụ ihe na-amasị m.

144Iwu gị niile bụ ezi omume ruo mgbe ebighị ebi; nye m nghọta, ka m nwe ike dị ndụ.

145Eji m obi m niile na-akpọ oku; zaa m o Onyenwe anyị, aga m erubekwa isi nye ụkpụrụ gị niile.

146Ana m akpọku gị; zọpụta m aga m erube isi nye ụkpụrụ gị niile.

147Tupu chị na-abọ, ana m ebili, na-akwa akwa maka enyemaka; olileanya m dị nʼokwu gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.