142Ezi omume gị na-adị ruo mgbe ebighị ebi. Iwu gị niile bụkwa eziokwu.
143Nsogbu na ihe mgbu adakwasịla m, ma iwu gị niile bụ ihe na-amasị m.
144Iwu gị niile bụ ezi omume ruo mgbe ebighị ebi; nye m nghọta, ka m nwe ike dị ndụ.
145Eji m obi m niile na-akpọ oku; zaa m o Onyenwe anyị, aga m erubekwa isi nye ụkpụrụ gị niile.
146Ana m akpọku gị; zọpụta m aga m erube isi nye ụkpụrụ gị niile.