155Nzọpụta dị anya nʼebe ndị na-eme ihe ọjọọ nọ, nʼihi na ha anaghị agbaso ụkpụrụ gị niile.
156O Onyenwe anyị, ọmịiko gị dị ukwuu; chebe ndụ m dịka iwu gị niile si dị.
157Ndị iro m na ndị na-akpagbu m dị ọtụtụ, ma aga m anọgide na-edebe iwu gị.
158Ana m asọ ndị niile na-enweghị okwukwe nʼime gị oyi, nʼihi na ha anaghị erubere okwu gị isi.
159Lee ka m si hụ ụkpụrụ gị niile nʼanya; chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka ịhụnanya gị si dị.