156O Onyenwe anyị, ọmịiko gị dị ukwuu; chebe ndụ m dịka iwu gị niile si dị.
157Ndị iro m na ndị na-akpagbu m dị ọtụtụ, ma aga m anọgide na-edebe iwu gị.
158Ana m asọ ndị niile na-enweghị okwukwe nʼime gị oyi, nʼihi na ha anaghị erubere okwu gị isi.
159Lee ka m si hụ ụkpụrụ gị niile nʼanya; chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka ịhụnanya gị si dị.
160Okwu gị niile bụ eziokwu; iwu gị niile ziri ezi na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.