153Ledata anya ka ị hụ ịta ahụhụ m ma gbapụta m, nʼihi na echefughị m iwu gị.
154Kpepụta m, gbapụta m, chebe ndụ m dịka nkwa gị si dị.
155Nzọpụta dị anya nʼebe ndị na-eme ihe ọjọọ nọ, nʼihi na ha anaghị agbaso ụkpụrụ gị niile.
156O Onyenwe anyị, ọmịiko gị dị ukwuu; chebe ndụ m dịka iwu gị niile si dị.
157Ndị iro m na ndị na-akpagbu m dị ọtụtụ, ma aga m anọgide na-edebe iwu gị.