152Site na mgbe ochie ka m mụtara site nʼụkpụrụ gị, na i mere ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
153Ledata anya ka ị hụ ịta ahụhụ m ma gbapụta m, nʼihi na echefughị m iwu gị.
154Kpepụta m, gbapụta m, chebe ndụ m dịka nkwa gị si dị.
155Nzọpụta dị anya nʼebe ndị na-eme ihe ọjọọ nọ, nʼihi na ha anaghị agbaso ụkpụrụ gị niile.
156O Onyenwe anyị, ọmịiko gị dị ukwuu; chebe ndụ m dịka iwu gị niile si dị.