32Aga m agbaso iwu gị niile nʼihi na i meela ka obi m nwere onwe ya.
33O Onyenwe anyị, zi m ụzọ m ga-esi gbasoo iwu gị niile; mgbe ahụ, aga m edebe ha ruo nʼọgwụgwụ.
34Nye m nghọta, aga m edebe iwu gị ma jiri obi m niile rubere ya isi.
35Duo m nʼụzọ nke iwu gị niile, nʼihi na ọ bụ nʼime ha ka m na-achọta obi ụtọ.
36Mee ka obi m chee ihu nʼiwu gị niile ọ bụghị nye uru na-esite nʼọchịchọ nke onwe.