42mgbe ahụ, aga m azaghachi onye ahụ na-achị m ọchị, nʼihi na ana m atụkwasị obi m nʼokwu gị.
43Esitela nʼọnụ m napụ okwu nke eziokwu, nʼihi na olileanya m dị nʼiwu gị niile.
44Aga m anọgide na-erubere iwu gị isi ruo mgbe ebighị ebi.
45Aga m ejegharị nʼọnọdụ inwere onwe nʼihi na achọpụtala m ụkpụrụ gị niile.
46Aga m ekwupụta banyere ụkpụrụ gị nʼihu ndị eze ma ihere agaghị eme m,