48Ana m eweliri iwu gị niile aka elu, bụ ndị m hụrụ nʼanya, ana m atụgharịkwa uche nʼiwu gị niile.
49Cheta okwu i nyere ohu gị, nʼihi na i nyela m olileanya.
50Nkasiobi m nʼime ịta ahụhụ m bụ nke a: nkwa gị na-echebe ndụ m.
51Ndị mpako na-akwa m emo na-esepụghị aka, ma anaghị m esite nʼiwu gị wezuga onwe m.
52O Onyenwe anyị, ana m echeta iwu gị niile, ndị dị site na mgbe ochie, ha na-ewetara m nkasiobi.