Abụ Ọma 119

Aga m erubere iwu gị niile isi; biko ahapụkwala m.

Psalm 119:8 (UKJV) I will keep your statutes: O forsake me not utterly.

6Mgbe ahụ, ihere agaghị eme m mgbe m tulere uche nʼiwu gị niile.

7Aga m eji obi ziri ezi too gị dịka m na-amụ ihe banyere iwu gị ziri ezi.

8Aga m erubere iwu gị niile isi; biko ahapụkwala m.

9Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ? Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị.

10Eji m obi m niile na-achọsi gị ike. Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.