1O Onyenwe anyị, lee na eze na-aṅụrị ọṅụ nʼike gị. Obi na-atọkwa ya ụtọ nke ukwuu nʼihi mmeri niile i nyere ya!
2I nyela ya ihe obi ya chọrọ; i mekwaara ya ihe niile ọ rịọrọ gị! Sela
3I ji ngọzị bara ụba nabata ya, ọ bụkwa okpueze e ji ọlaedo a ṅụchara nke ọma kpụọ ka i kpukwasịrị ya nʼisi.
4Ọ rịọrọ ka i nye ya ndụ, i zara ekpere ya mekwaa ka o nwee ogologo ndụ nke ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
5Nsọpụrụ ya dị ukwuu site na mmeri niile i nyere ya, ebube na ịma mma bụ onyinye i nyere ya.