Abụ Ọma 21

Ị ga-anwụchi ndị iro gị niile; aka nri gị ga-ejidekwa ndị kpọrọ gị asị.

Psalm 21:8 (UKJV) Yours hand shall find out all yours enemies: your right hand shall find out those that hate you.

6Nʼezie, i nyela ya ngọzị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, i mere ka o nwee obi ụtọ nke na-esite nʼọṅụ nke nọnyere gị.

7Nʼihi na eze na-atụkwasị Onyenwe anyị obi, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya site nʼịhụnanya nke Onye kachasị ihe niile elu nke na-enweghị ọgwụgwụ.

8Ị ga-anwụchi ndị iro gị niile; aka nri gị ga-ejidekwa ndị kpọrọ gị asị.

9Mgbe ị pụtara ịlụ ọgụ, ị ga-erepịa ha dịka ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu. Nʼoke iwe ya, Onyenwe anyị ga-elo ha, ọkụ ya ga-erepịakwa ha.

10Ị ga-esite nʼelu ụwa laa agbụrụ ha niile nʼiyi, ụmụ ha kwa site, nʼetiti ụmụ mmadụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.