Abụ Ọma 21

Mgbe ị pụtara ịlụ ọgụ, ị ga-erepịa ha dịka ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu. Nʼoke iwe ya, Onyenwe anyị ga-elo ha, ọkụ ya ga-erepịakwa ha.

Psalm 21:9 (UKJV) You shall make them as a fiery oven in the time of yours anger: the LORD shall swallow them up in his wrath, and the fire shall devour them.

7Nʼihi na eze na-atụkwasị Onyenwe anyị obi, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya site nʼịhụnanya nke Onye kachasị ihe niile elu nke na-enweghị ọgwụgwụ.

8Ị ga-anwụchi ndị iro gị niile; aka nri gị ga-ejidekwa ndị kpọrọ gị asị.

9Mgbe ị pụtara ịlụ ọgụ, ị ga-erepịa ha dịka ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu. Nʼoke iwe ya, Onyenwe anyị ga-elo ha, ọkụ ya ga-erepịakwa ha.

10Ị ga-esite nʼelu ụwa laa agbụrụ ha niile nʼiyi, ụmụ ha kwa site, nʼetiti ụmụ mmadụ.

11Nʼagbanyeghị na ha nwere ike ịpịa ọpịpịa ọjọọ megide gị, maọbụ tụpụta atụmatụ ọjọọ, ha agaghị emezu ebumnuche ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.