10Onyenwe anyị na-emebi atụmatụ mba niile; ọ na-emebi ebumnobi ụmụ mmadụ.
11Atụmatụ Onyenwe anyị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ebumnobi ya ruo ọgbọ niile.
12Mba a gọziri agọzi ka mba ahụ bụ, bụ ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha; bụ ndị ọ họpụtara ka ha bụrụ ihe nketa ya.
13Onyenwe anyị si nʼeluigwe na-ele ndị mmadụ bi nʼụwa anya. Ọ na-ahụzu ụmụ mmadụ niile anya.
14O sitere nʼebe obibi ya na-ele onye ọbụla bi nʼelu ụwa anya.