5Onyenwe anyị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya; ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya ya nke na-enweghị ọgwụgwụ.
6Ọ bụ site nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị ka e ji kee eluigwe niile, jirikwa nkuume nke ọnụ ya mee anwụ, na ọnwa na kpakpando niile.
7Ọ bụ ya kekwara osimiri niile chịkọta ha nʼotu ebe, kpaa oke ebe ha ga-anọ dịka ụlọakụ dị ukwuu.
8Ka ụwa niile tụọ Onyenwe anyị egwu; ka mmadụ niile bi nʼụwa sọpụrụ ya.
9Nʼihi na o kwuru okwu, okwu ahụ mezukwara; o nyere iwu, iwu ahụ guzokwara chịm.