1Echegbula onwe gị nʼihi ndị na-eme ihe ọjọọ, maọbụ kwosa ndị na-eme ihe ọjọọ ekworo;
2nʼihi na mgbe na-adịghị anya, ha ga-akpọnwụ dịka ahịhịa, dịka ahịhịa ndụ, ha ga-anwụkwa.
3Tụkwasị Onyenwe anyị obi meekwa ihe ziri ezi; biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ.
4Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ. Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị.