31Iwu Chineke ya dị ya nʼobi; nzọ ukwu ha adịghị agbụchapụ.
32Ndị ajọ omume na-echere ndị ezi omume na nzuzo, na-achọ ịnapụ ha ndụ ha;
33ma Onyenwe anyị agaghị ahapụ ha nʼaka ha, ọ gaghị ekwe ka a maa ha ikpe mgbe a na-ekpe ha ikpe.
34Chere Onyenwe anyị, debekwa ụzọ ya. Ọ ga-ebuli gị elu ka i nweta ala ahụ dịka ihe nketa; mgbe a na-egbuchapụ ndị ajọ omume, ị ga-eji anya gị hụ ya.
35Ahụla m onye ajọ omume na nwoke na-eme ihe ike, ka ọ na-eto, na-awasa, dịka osisi dị ndụ nʼezi ala,